Ilu 15 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;

ma okwu ike na-akpali iwe.

2Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,

ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.

3 Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile,

anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.

4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;

ma nkwutọ na-eweta ịda mba.

5Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;

ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.

6Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,

ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.

7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,

ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.

8 Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,

ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.

9 Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,

ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.

10Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.

Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.

11 Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;

ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?

12Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,

ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.

13Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.

Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.

14Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,

ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.

15Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,

ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.

16Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,

karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.

17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,

karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.

18Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;

ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.

19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,

ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.

20Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,

ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.

21Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,

ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.

22Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,

ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.

23Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,

okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.

24Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,

iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.

25 Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,

ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.

26Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị

ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.

27Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.

Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.

28Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya

ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.

29 Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso;

ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.

30Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.

Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.

31Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ

ga-esoro ndị amamihe nọrọ.

32Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị

ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.

33Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;

onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help