Abụ Ọma 6 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 6Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.Ekpere nʼoge nsogbu

1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.

Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.

2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.

Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.

3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.

Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?

4 Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;

nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.

5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.

O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?

6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.

Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,

ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.

7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;

ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.

8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,

nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.

9 Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.

Ọ nabatala ekpere m.

10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.

Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help