Ọpụpụ 11 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ogbugbu ụmụ e buru ụzọ mụọ

1 Onyenwe anyị gwara Mosis, “Aga m ewetara Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ekwe ka unu si nʼebe a pụọ. Nʼeziokwu, ọ ga-eji aka ya chụpụ unu nʼala ya.

2Gwa nwoke na nwanyị Izrel ọbụla ka ha jikere. Ha rịọọ ndị agbataobi ha bụ ndị Ijipt, ka ha nye ha ihe ọbụla e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.”

3Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.

4Ya mere, Mosis sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼihe dịka nʼetiti abalị taa, aga m agafe nʼime ala Ijipt niile.

5Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.

6Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ.

7Ma nʼebe ụmụ Izrel nọ, nkịta agaghị agbọ nwoke maọbụ nwanyị maọbụ anụmanụ ọbụla ụja.’ Site na nke a, ị ga-amata na Onyenwe anyị na-akpa oke nʼetiti ndị Izrel na ndị Ijipt.

8Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.

9 Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, “Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt.”

10Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help