Abụ Ọma 127 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 127Abụ nrigo, nke Solomọn.Chineke dị mkpa

1Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,

ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,

nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ

na-adọgbu onwe gị nʼọrụ

ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,

nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.

3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,

ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.

4Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,

otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.

5Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ

onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.

Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro

na-arụrịta ụka nʼama.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help