Maika Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Maika buru amụma ya nʼoge Aịzaya na-ebukwa amụma ya. Ọ bụ nʼobodo nta Moreshet ka o bi, ma ndị o bu nʼuche kwuo okwu ya niile bụ ndị bi na Jerusalem na Sameria. O kwuru okwu megide mmehie dị iche iche dị nʼoge ahụ, dịka mmegbu, nganga, anya ukwu, aghụghọ, izu ohi na mpako. Ebe Jerusalem na Sameria bụ isi obodo e nwere nʼoge ahụ, Maịka kwuru na ọ bụ ha kwesiri ịbụ ihe ịmaatụ nye obodo nta ndị ọzọ otu e si ebi ndụ ezi omume.Usoro e si dee ya:Ikpe ọmụma Chineke 1Chineke kpọrọ mmehie asị 2–3Ngọzị nke oge dị nʼihu 4–5Onye nzọpụta dịrị Izrel 6–7