2 Samuel Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akụkọ a kọrọ nʼakwụkwọ a bụ akụkọ gbasara ọchịchị Devid dị ka eze Izrel. E bidoro akụkọ a site na mmalite mgbe e mere Devid eze. A kọkwara ihe gbasara otu Devid siri merie ndị niile chọrọ imegide ọnọdụ ịbụ eze ya. Deekwa otu Jerusalem si ghọọ isi obodo Izrel, na otu e si bubata igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ; na otu e si merie ndị Filistia nʼagha. A kọkwara akụkọ banyere nsogbu Devid nwere nʼoge ọ bụ eze, dị ka akụkọ nnupu isi Absalọm, na akụkọ mmehie ịkwa iko nke Devid mere. E ji akụkọ metụtara ọnọdụ Devid mgbe ọ ghọrọ agadi, mechie ihe e dere nʼakwụkwọ a.Usoro e si dee ya:Ihe dị iche iche Devid mere mgbe e mere ya eze 1–5Mmeri Devid meriri ndị Filistia 6–11Mmehie Devid na ịba mba Netan 12:1-25Nsogbu bịakwasịrị Devid 12:26–21:22Abụ otuto Devid 22:1–23:7Nsogbu ndị ọzọ Devid nwere 23:8–24:25