Diuteronomi 8 - Igbo Contemporary Bible 2020

Echezọla Onyenwe anyị

1Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ Onyenwe anyị kwere nna nna gị ha na nkwa.

2Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya.

3E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.

4Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.

5Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị.

6Debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu.

7Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu,

8ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ.

9Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile.

10Mgbe i riri rijuo afọ, too Onyenwe anyị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị.

11Ma lezie anya ka ị ghara ichefu Onyenwe anyị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa.

12Ka ọ ghara ị bụ, mgbe i riri rijuru afọ, mgbe i wuuru onwe gị ezi ụlọ dị mma birikwa nʼime ha,

13mgbe igwe ehi na igwe atụrụ gị mụbara, mgbe ọlaọcha na ọlaedo gị mụbara, na mgbe ihe niile i nwere mụbara.

14Kpachara anya hụ na nganga abanyeghị gị nʼobi, ime ka i chefuo Onyenwe anyị Chineke gị onye mere ka ị site nʼIjipt, sitekwa nʼala ịbụ ohu pụta.

15Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ

16O ji mánà nyejuo gị afọ nʼọzara, mánà ahụ nna gị ha na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya nʼihi iweda mmụọ gị ala, na ịnwale gị, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma.

17I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.”

18Ma cheta Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa.

19Ma ọ bụrụ na i chefuo Onyenwe anyị bụ Chineke gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi.

20Ọ bụrụ na unu egeghị ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke unu, ime ihe ọ chọrọ, ọ ga-ala unu nʼiyi, dịka o si bibie mba ndị a niile dị iche iche ọ na-ebibi nʼihi unu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help