Abụ Ọma 63 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 63Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda.Onye ihe Chineke na-agụsị agụụ ike

1O Chineke, ị bụ Chineke m,

e ji m obi m niile na-achọ gị;

akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,

anụ ahụ m na-achọsi gị ike,

nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba

ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.

2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị,

hụkwa ike gị na ebube gị.

3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,

aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,

aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ;

aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.

6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị,

ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.

7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m,

ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.

8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ;

aka nri gị na-ejigide m.

9A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi;

ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.

10A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi,

ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.

11Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;

ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,

ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help