Hosiya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Hosiya bụ onye amụma Chineke. O buru amụma ya nʼala Izrel tupu ndị agha Asịrịa abịa laa obodo ahụ nʼiyi. Ihe abụọ pụtara ihe nʼakwụkwọ Hosiya bụ, ịhụnanya Chineke, na njehie ndị Izrel. Chineke sitere nʼihe mere nʼezinaụlọ Hosiya gosi ihe na-eme nʼetiti ya na ndị Izrel. Dị ka nwunye Hosiya si hapụ ya pụọ na-esogharị ụmụ nwoke ndị ọzọ, otu a ka Izrel si hapụ Chineke bido na-esogharị chi ndị ọzọ. Ma dị ka Hosiya si nọgide hụ nwunye ya nʼanya, otu a kwa ka Chineke si nọgide hụ Izrel nʼanya. Ndị amụma ọzọ buru amụma nʼoge Hosiya bụ Emọs, Aịzaya na Maịka.Usoro e si dee ya:Ọnọdụ ezinaụlọ Hosiya 1–3

Nnupu isi Izrel megide Chineke 4–8

Ikpe ọmụma nke na-abịa 9–13

Nkwa nzọpụta 14

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help