Abụ Ọma Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Abụ Ọma bụ akwụkwọ nke na-atọ ọtụtụ ndị mmadụ na-agụ ya ụtọ. Ọ bụ akwụkwọ na-egosi anyị ụzọ dị iche iche ndị biri nʼọgbọ gara aga si kpọkuo Chineke nʼọnọdụ ọbụla. Anyị na-agụta ụdị abụ dị iche iche, nke ha bụrụ maka ito Chineke, maọbụ nke ha bụrụ maka ịrịọ ya mgbaghara mmehie, maọbụ nke ha bụrụ nʼoge ọṅụ maọbụ nʼoge iru ụjụ; nke ha bụrụ nʼoge okwukwe ha siri ike maọbụ nʼoge obi ha dara mba; nke ha bụrụ nʼoge ọnụma na iwe juru ha obi, maọbụ nʼoge obi ha dị jụụ. Abụ ndị ọzọ dị nʼakwụkwọ a bụ abụ e ji echeta ọrụ ukwu Chineke rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ nke Chineke na-arụ nʼoge ahụ ndị dere ụfọdụ nʼime Abụ Ọma dere ha. E dekwara abụ metụtara ọrụ ebube e lere anya na Chineke ga-arụ nʼoge dị nʼihu. Nʼọtụtụ ebe dị iche iche nʼime akwụkwọ Abụ Ọma a, e dere abụ gosiri nhụju anya na mmeri nke ga-adịrị Kraịst, Onye ahụ Chineke tere mmanụ.Usoro e si dee ya:Akwụkwọ Abụ Ọma nke mbụ 1–41Akwụkwọ Abụ Ọma nke abụọ 42–72Akwụkwọ Abụ Ọma nke atọ 73–89Akwụkwọ Abụ Ọma nke anọ 90–106Akwụkwọ Abụ Ọma nke ise 107–150