Nehemaya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ Nehemaya gakwara nʼihu ịkọ akụkọ ọnọdụ ndị Juda si Babilọn lọta nke akwụkwọ Ezra malitere. Ọkpụrụkpụ okwu pụtara ihe nʼakwụkwọ Ezra bụ mwugharị e wugharịrị ụlọnsọ ukwu, ma ọkpụrụkpụ okwu pụtara ihe nʼakwụkwọ Nehemaya bụ mwugharị e wugharịrị mgbidi gbara obodo Jerusalem gburugburu. A malitere akwụkwọ a site nʼịkọwa mkpa ọ dị iwugharị mgbidi ahụ, mesịa kọwaa otu e si wuo ya, na nsogbu niile dapụtara mgbe ha na-ewu ya. A kọrọ akụkọ otu e si doo otu ụbọchị iche maka ndị Juda niile ikwupụta mmehie ha, na otu e si mesịa wuchaa mgbidi ahụ.Usoro e si dee ya:Nlọta Nehemaya na Jerusalem 1–2Mmalite ọrụ iwugharị mgbidi 3–7Ngụpụta iwu Chineke na nkwupụta mmehie 8–10Ido mgbidi ahụ nsọ 11–13