Abụ Ọma 126 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 126Abụ nrigo.Abụ ekele maka mgbapụta

1Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,

anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.

2Ọchị juru anyị ọnụ,

abụ ọṅụ jukwara anyị ire.

Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,

“Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”

3 Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,

obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.

4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị,

dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.

5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ

ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.

6Onye ji ịkwa akwa

buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,

ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,

mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help