Jenesis Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:E dere ihe dị nʼakwụkwọ Jenesis maka ịkọwa otu ihe niile siri malite. A kọwara na ọ bụ Chineke kere eluigwe niile na ụwa, kọwaa na e kere mmadụ nʼoyiyi Chineke, meekwa ya ka ọ nọdụ nʼebe dị nnọọ mma. A kọwara otu mmehie si bata nʼụwa, na otu Chineke si gbooro mmadụ mehiere megide iwu Onye kere ya mkpa nzọpụta. Nʼime akwụkwọ a, a ga-agụta otu ibi obi ndị mmadụ si malite, otu ọrụ ǹka niile si bido, na otu asụsụ dị iche iche si malitekwa. A ga-agụta ebe mba dị iche iche si pụta. Akwụkwọ a kọkwara akụkọ banyere mba ndị Juu, otu o si bido site nʼaka Ebraham, Aịzik na Jekọb, kọwaakwa otu ndị Juu si biri nʼala Ijipt.Usoro e si dee ya:Okike eluigwe na ụwa 1–2Nnupu isi na mmalite mmehie 3–4Akụkọ gbasara ibi ndụ ndị mmadụ ruo nʼoge uju mmiri 5–9Mgbasa ụmụ mmadụ nʼelu ụwa 10–11Akụkọ ndụ Ebraham 12:1–25:18Akụkọ ndụ Aịzik 25:19–26:35Akụkọ ndụ Jekọb na Ịsọ 27:1–37:1Akụkọ ndụ Josef 37:2–50:26