Abụ Ọma 71 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 71Ekpere maka ndụ ogologo

1 Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ;

ekwela ka ihere mee m.

2Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m;

tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.

3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,

ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla;

nye iwu maka nzọpụta m,

nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.

4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ,

ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.

5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị,

ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.

6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;

gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Aga m anọgide na-eto gị.

7Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ,

ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.

8Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,

ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

9Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi;

ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.

10Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m;

ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.

11Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ;

chụọ ya ọsọ, jidekwa ya,

nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”

12O Chineke, anọla m ebe dị anya;

O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.

13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;

ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi

ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.

14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;

aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.

15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị

na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,

ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.

16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,

aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.

17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,

ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.

18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,

mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,

tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,

na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.

19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,

gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.

O Chineke, onye dị ka gị?

20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu

nke dị ilu,

ị ga-atụte ndụ m ọzọ;

site nʼebe dị omimi nke ụwa,

ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.

21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.

Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.

22O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,

nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;

aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,

gị Onye nsọ nke Izrel.

23Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ

mgbe m na-abụku gị abụ otuto,

mụ, onye ị gbapụtara.

24Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta

ọrụ ezi omume gị niile,

nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ,

ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help