Jeremaya 30 - Igbo Contemporary Bible 2020

Nlọta ụmụ Izrel

1Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.

2“Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.

3Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”

4Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda.

5“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu,

nke oke egwu, ọ bụghị udo.

6Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,

nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ?

Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike

ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme,

ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?

7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.

O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.

Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,

ma a ga-anapụta ya site na ya.

8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’

‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,

tibisikwaa agbụ niile e kere ha.

Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,

na Devid eze ha,

onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.

10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.

Atụkwala ụjọ gị Izrel,’

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,

zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.

Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.

Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.

11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,

bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,

agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.

Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,

ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’

12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,

“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,

mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.

13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,

o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.

Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.

14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;

ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.

E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;

ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,

nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,

mmehie gị dịkwa ọtụtụ.

15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?

Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?

Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,

na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.

16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;

ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.

Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.

Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.

17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;

aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.

Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’

18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya;

aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.

A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;

ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.

19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,

na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.

Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,

ha agaghị adịkwa ole na ole.

Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,

ndị a na-agaghị eledakwa anya.

20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,

nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m.

Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.

21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;

onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta.

Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso,

nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam,

maka ịbịaru m nso?’

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m,

mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”

23Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya

mee ka oke ifufe ya fee.

Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu

dịka ifufe na-efesi ike.

24Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị

tutu ruo mgbe o mezuru

ihe ndị o bu nʼobi.

Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa

unu ga-aghọta ihe ndị a.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help