Ekiliziastis 10 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ.

Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.

2Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi,

ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.

3Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya,

nʼihi na o maghị ihe.

Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.

4Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị,

ahapụla ọnọdụ gị,

nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.

5Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ,

dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.

6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu,

ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.

7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya,

ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.

8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya!

Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.

9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị.

Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.

10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ,

ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ,

a ga-etinye ike karịa,

ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.

11Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ,

ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.

12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara,

ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi

13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu,

ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.

14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.

Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime,

onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?

15Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,

ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.

16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,

nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.

17Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ,

nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike,

ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.

18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri;

ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.

19Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị,

mmanya na-enye obi ụtọ,

ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.

20Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị;

maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị,

nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị

nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help