Abụ Ọma 98 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 98Abụ Ọma.Toonu Onyenwe anyị onye ezi omume

1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,

nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube;

aka nri ya na aka nsọ ya

arụpụtarala ya nzọpụta.

2 Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya

o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.

3O chetala ịhụnanya ya

na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị;

nsọtụ nke ụwa niile ahụla

nzọpụta Chineke anyị.

4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile

jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

5werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ,

e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,

6jirinụ opi na opi ike,

tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.

7Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya,

ụwa na ndị niile bi nʼime ya.

8Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha,

ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;

9ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị,

nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.

Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe.

Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help