Abụ Ọma 70 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 70Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ.Ekpere maka nnapụta

1O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m,

O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.

2Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,

bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m

laghachi azụ nʼihere.

3Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!”

laghachi azụ nʼihi ihere ha.

4Ma ka ndị niile na-achọ gị

ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị,

ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,

“Onyenwe anyị dị ukwuu.”

5Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa;

O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m.

Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;

O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help