Abụ Ọma 32 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 32Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil.

Nkwupụta na mgbaghara mmehie

1Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,

onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,

onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.

2Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,

onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,

onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.

3Mgbe m gbachiri nkịtị,

ọkpụkpụ m rere ure

site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.

4Ehihie niile na abalị niile,

ị tara m ahụhụ,

ume dị m nʼobi gwụchara,

dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela

5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,

kwụsịkwa izo ha ezo.

Agwara m onwe m okwu sị,

“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”

Ị gbaghakwaara m

ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela

6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere

mgbe e nwere ike ịchọta gị;

nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,

ọ gaghị erute ha.

7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;

Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.

Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela

8Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;

Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.

9Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu

nke na-enweghị akọnuche,

nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,

ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.

10Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,

ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,

na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.

11Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;

bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help