Ndị Filipai Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Pọl dere akwụkwọ a nʼoge e tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ na Rom nʼihi ikwusa oziọma. O dere ya maka ikele nzukọ Kraịst dị na Filipai ekele nʼihi onyinye ha ziteere ya. Ọ kọọrọ ha ihe bụ ọnọdụ ya nʼụlọ mkpọrọ ahụ, ma gwa ha na ndụ onye Kraịst bụ ndụ zuruoke, nke kwesiri iwetara onye Kraịst ọnụ nʼime obi ya mgbe niile. O dere gwa ha na onye Kraịst ọbụla kwesiri ibi ndụ udo, ndụ ịkpazi agwa, ndụ ịdị ike nʼime mmụọ, ndụ obi umeala, ndụ ịṅụrị ọṅụ nʼọnọdụ ọbụla. O ji ndụ umeala nʼobi Kraịst maara ha atụ ka ha si otu a bie ndụ nke ha.Usoro e si dee ya:Ọnọdụ Pọl na Rom 1

Ndụ umeala nʼobi Kraịst 2

Ibi ndụ dị ka onye Kraịst 3

Udo si nʼebe Chineke nọ abịa 4

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help