Daniel Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Daniel so na ndị a dọtara nʼagha mgbe e bibiri Jerusalem. Ma mgbe ọ nọ na Babilọn o nwetara ọzụzụ pụrụ iche, mesịa ghọọ otu nʼime ndị ozi eze Babilọn pụtara ihe. Ọ bụkwa otu nʼime ndịisi ọchịchị nʼoge ndị Peshịa bidoro ịchị. Daniel bụ onye nwere okwukwe nʼime Chineke, onye e sitere nʼihi okwukwe dị otu a o nwere tụnye nʼime olulu ọdụm. Akwụkwọ a kọrọ akụkọ ndụ Daniel, na ọtụtụ ihe dị iche iche mere nʼoge ya. Ma e nwere amụma dị iche iche e depụtara nʼime ya nke gbasara ihe ga-emezu nʼoge dị nʼihu. Daniel buru amụma banyere alaeze ukwu dị iche iche nke ga-adị nʼoge dị nʼihu, bukwaa amụma banyere Onye ahụ e tere mmanụ, bụ Jisọs Kraịst, onye ga-abịa laa ike ọjọọ nke ụwa nʼiyi, ma malite ọchịchị alaeze ya, nke dabeere nʼezi omume, alaeze nke ga-adịgide ruo mgbe niile.Usoro e si dee ya:Ndụ Daniel na Babilọn 1–6

Ọhụ Daniel hụrụ 7–8

Ekpere Daniel na amụma o buru 9

Ọhụ Daniel banyere ihe ndị ga-eme nʼoge dị nʼihu 10–12

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help