Habakuk Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Habakuk buru amụma ya nʼala Juda tupu ndị Babilọn adọta ndị bi nʼime ya nʼagha. Nʼoge a, e mere ka ọ hụ ụdị ịla nʼiyi na-aga ịbịakwasị ndị ya. Nʼihi ya, Habakuk bidoro ịjụ ụzọ ajụjụ abụọ. Nke mbụ, ọ chọrọ ịmata ihe mere Chineke ji gba nkịtị mgbe ihe ọjọọ na-aba ụba nʼala Juda. Nke abụọ, ọ chọrọ ịghọta ihe mere Chineke ji kpebie iji mba a maara dịka ndị mmehie mere ngwa ọrụ ya, ịta ndị nke ya ahụhụ. Chineke zara Habakuk ajụjụ abụọ ndị a. Ma o mere karịa nke a, o mere ka Habakuk hụ ya anya. Anya Habakuk hụrụ Chineke gbakwara Habakuk ume iguzosi ike.Usoro e si dee ya:Mmehie na ahụhụ so ya 1:1-11Chineke na ndị Babilọn 1:12–2:20Abụ mmeri nke Habakuk 3