Abụ Ọma 36 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 36Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị.Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke

1E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke

banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:

Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke

dị nʼanya ha.

2Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,

na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.

3Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;

ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.

4Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;

ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,

ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.

5O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,

ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.

6Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,

ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.

O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.

7Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!

Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.

8Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;

Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.

9Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;

ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.

10Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,

ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.

11Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,

ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.

12Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,

a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help