Izikiel 31 - Igbo Contemporary Bible 2020

Fero dịka osisi sida nke Lebanọn

1O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha,

“ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?

3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa,

nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya.

Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn,

nke jupụtara nʼalaka mara mma,

nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo,

nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.

4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,

na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.

Iyi ha niile

na-asọ nʼokpuru ya.

Ebe ahụ ka ha si ezipu

ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.

5Nʼihi ya, o toro tokarịa

osisi niile nʼogologo.

Ngalaba ya bara ụba,

alaka ya topụkwara ogologo

nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.

6Nʼalaka ya niile

ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,

nʼokpuru ndo nke alaka ya niile

ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,

oke mba niile dị iche iche

bikwara nʼokpuru ndo ya.

7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,

nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,

nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba

nʼebe mmiri dị ukwuu.

8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige

erughị ya nʼọtụtụ.

Ọ dịghị osisi junipa niile

nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,

osisi plenụ niile

adịghịkwa ka alaka ya,

ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,

nke yiri ya nʼịma mma ya

9Emere m ya ka ọ maa mma

site nʼịba ụba nke alaka o nwere,

ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden

nʼubi Chineke a gbara ogige.

10“ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,

11Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.

12Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.

13Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.

14Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.

15“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya.

16Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma.

17Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche.

18“ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo.

“ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help