Abụ Ọma 26 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 26Abụ Ọma Devid.Ekpere nke ezi mmadụ

1 Onyenwe anyị, biko kpepụta m,

nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;

atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,

na-eleghị anya nʼazụ.

2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,

nyochaa obi m na echiche m.

3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.

Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.

4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.

Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.

5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.

Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.

6Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,

na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.

7Ana m abụkwa abụ ekele,

jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.

8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,

ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.

9Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,

ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,

10ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,

aka nri ha jupụtakwara na ngarị.

11Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;

gbapụta m ma meere m ebere.

12Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;

aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help