Ndị Ikpe Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ a na-akọrọ anyị otu ndị ndu dị iche iche a kpọrọ ndị ikpe si chịa ụmụ Izrel nʼala Kenan. Nʼoge a ndị ikpe na-achị, a ga-agụta otu ụmụ Izrel si bie ndụ nnupu isi megide Chineke, na otu Chineke si kwenye ka ndị mba ọzọ merie ha nʼagha, ma kpagbukwaa ha. Anyị ga-agụtakwa otu Chineke si zitere ha ndị ikpe ndị bịara zọpụta ha site nʼaka ndị iro ha. Ma akwụkwọ a na-egosi anyị na o nweghị oge ụmụ Izrel ji mụta na nnupu isi megide Chineke bụ ihe na-eweta mbibi na ịla nʼiyi.Usoro e si dee ya:Nchịkọta okwu banyere ọnọdụ ụmụ Izrel 1:1–3:4

Otniel, Ehud, na Shamga 3:5-31

Debọra na Barak 4–5

Gidiọn 6–8

Abimelek 9

Tola, Jaịa, Jefta, Ibzan, Ilọn na Abdon 10–12

Samsin 13–16

Oge onye-na-nke-ya 17–21

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help