Abụ Ọma 137 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 137Abụ ndị a dọtara nʼagha

1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa

mgbe anyị chetara Zayọn.

2Ọ bụ nʼosisi pọpla

ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.

3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,

ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;

ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”

4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị

ebe anyị nọ nʼala ọzọ?

5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,

ka aka nri m chefuo ǹka ya.

6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,

ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche

banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,

ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.

7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere

nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.

“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,

“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”

8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,

ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị

nʼihi ihe i mere anyị,

9onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara

tụpịa ha nʼelu nkume.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help