Abụ Ọma 39 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 39Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.Nkwupụta mmehie

1Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile

ma debe ire m ka m ghara ikwuhie;

aga m eji ihe kechie ọnụ m

mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”

2Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu,

jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma,

oke ihe mgbu m mụbara.

3Obi m kporo ọkụ nʼime m,

ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere;

mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:

4“O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m

na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;

mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.

5I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta;

ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị.

Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume

ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela

6“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo

nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,

na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.

7“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya?

Olileanya m dị nʼime gị.

8Zọpụta m site na mmehie m niile;

ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.

9Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu,

nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.

10Kwụsị iti m ihe;

ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.

11Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha;

ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla,

mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela

12“O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,

gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka;

emechila ntị gị nye ibe akwa m.

Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa,

dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.

13Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ,

tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help