Aịzaya 45 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ,

bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya

megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya,

napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile,

megheere ya ọnụ ụzọ niile

nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya.

2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị

kwazee ugwu ukwu niile,

tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile

gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.

3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,

akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.

Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.

4Nʼihi Jekọb bụ ohu m,

nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,

ka m ji kpọọ gị aha gị

nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,

maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.

5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;

ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.

Ọ bụ ezie na ị maghị m,

ma aga m eme ka ị dịrị ike.

6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ

ruo nʼọdịda anyanwụ,

ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.

Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.

7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.

Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.

Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.

8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m

ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.

Ka ala meghee onwe ya,

ka nzọpụta pupụta,

ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.

Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.

9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,

mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju

nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.

Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,

‘Gịnị ka i ji m akpụ?’

Ka ọrụ gị ọ ga-asị,

‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?

10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,

‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’

maọbụ sịkwa nne ya,

‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’

11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel,

Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;

banyere ihe ndị gaje ime

ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,

maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?

12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa,

keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya.

Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe,

nyekwa kpakpando niile iwu.

13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:

M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.

Ọ ga-ewughachi obodo m,

mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,

ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,

ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush

na ndị Saba ahụ toro ogologo,

ha ga-abịakwute gị,

ha ga-abụ nke gị;

ha ga-esokwa gị nʼazụ

dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.

Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị

rịọ gị arịrịọ, na-asị,

‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,

ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ”

15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel.

Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.

16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere,

e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.

17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta

nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel.

Ihere agaghị eme ha.

A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.

18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị,

ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha.

Ọ bụ ya, bụ Chineke,

onye zubere ma kee ụwa,

tọkwaa ntọala ya.

O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu,

kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya.

Ọ sịrị,

“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị;

ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.

19Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu,

site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị.

Agwaghị m mkpụrụ Jekọb

‘Chọọnụ m nʼefu.’

Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu,

Ana m ekwupụta ihe ziri ezi.

20“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ,

bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ.

Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee,

ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.

21Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya,

ka ha gbaakọkwa izu.

Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga,

onye kwupụtara ya site na mgbe ochie?

Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị?

Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m,

Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta;

ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m.

22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu.

Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa.

Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.

23Ejirila m onwe m ṅụọ iyi,

ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume,

bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe:

Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala;

mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.

24E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị

ka ezi omume na ike dị.’ ”

Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya.

Ihere ga-emekwa ha.

25Ma agbụrụ niile nke Izrel

ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị,

ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help