Malakaị Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Malakaị bụ akwụkwọ ikpeazụ dị nʼagba ochie nke Baịbụlụ Nsọ. E zitere Malakaị onye amụma ka ọ bịa gbaa ndị Juu si Babilọn lọta ume nʼoge mmụọ ife na ịgbaso ụzọ Chineke malitere ịda mba. Nkwusa Malakaị kwusara metụtara mmehie dị iche iche ndị nchụaja mere, ya na ejeghị ije dị ka Chineke si chọọ ya nye mmadụ niile. O kwukwara okwu megide omume nke ịgbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ, nke dị nʼoge ahụ. O buru amụma banyere ọbịbịa nke Onye nzọpụta, bukwaa amụma banyere onye ahụ ga-ebu Onye nzọpụta ụzọ bịa idoziri ya ụzọ. Ọ kpọrọ onye ahụ Ịlaịja, ma o mesịrị pụta ìhè na ọ bụ Jọn omee baptizim ka o buru amụma ya. Nʼụzọ dị otu a, e ji olileanya banyere Onye nzọpụta nke na-abịa mechie Agba Ochie nke Baịbụlụ Nsọ.Usoro e si dee ya:Ịhụnanya Chineke na ndụ ọjọọ Izrel 1:1–2:9

Ekwesighị ntụkwasị obi Izrel 2:10-17

Ikpe ọmụma nke na-abịa 3:1-6

Otu ụzọ nʼụzọ iri 3:7-18

Ọbịbịa Onye nzọpụta 4

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help