Abụ Ọma 129 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 129Abụ nrigo.Ekpere megide ndị iro Izrel

1Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ka Izrel kwuo.

2“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ma ha enweghị ike merie m.

3Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,

mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.

4Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;

ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”

5Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị

bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.

6Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ

nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;

7nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,

maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.

8Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,

“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.

Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help