Abụ Ọma 138 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 138Abụ Ọma Devid.Onyenwe anyị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi

1O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị;

nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.

2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị

aga m etokwa aha gị

nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị,

nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị

dị elu karịa ihe niile.

3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m;

i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.

4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,

mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.

5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,

nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.

6Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,

ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.

7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,

ị na-echebe ndụ m;

ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị,

ị na-eji aka nri gị zọpụta m.

8 Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;

ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ahapụkwala ọrụ aka gị niile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help