Ilu 28 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,

ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.

2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,

ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.

3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,

bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.

4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,

ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.

5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,

ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.

6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu

karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.

7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,

ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.

8Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,

na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.

9Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,

ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.

10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,

ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,

ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.

11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,

ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.

12Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,

ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.

13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.

Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.

14Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,

ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.

15Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ

otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.

16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;

ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.

17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe

ruo ala mmụọ.

Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.

18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,

ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.

19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,

ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.

20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,

ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.

21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.

Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.

22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya

amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.

23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara

karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.

24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,

“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”

Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.

25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,

ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.

26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!

Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.

27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.

Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.

28Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,

ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help