Abụ Ọma 38 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 38Abụ Ọma Devid. Arịrịọ.Arịrịọ nʼoge nsogbu

1Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,

maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.

2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,

aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.

3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;

enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.

4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m

dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.

5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi

nʼihi mmehie enweghị uche m.

6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala

ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.

7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu

ahụ adịghịkwa m.

8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.

Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.

9O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;

ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.

10Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,

ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.

11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,

ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.

12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,

ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m;

ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.

13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,

dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.

14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,

onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

15O Onyenwe anyị, ana m eche gị;

o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;

maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”

17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.

Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.

18Ana m ekwupụta mmehie m;

mmehie m na-ewute m.

19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,

ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.

20Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,

na-ebo ebubo megide m

nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.

21O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;

O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.

22Bịa ọsịịsọ inyere m aka

Onyenwe m na Onye nzọpụta m.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help