Abụ Ọma 64 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 64Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.Ekpere maka nchekwa

1Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.

Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.

2Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,

site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.

3Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,

na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.

4Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,

na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.

5Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,

ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo,

ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?”

6Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,

“Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!”

Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.

7Ma Chineke ga-agba ha àkụ,

na mberede ka a ga-etida ha.

8Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,

mee ka ha laa nʼiyi;

ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.

9Mmadụ niile ga-atụ egwu,

ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke,

ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.

10Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,

ha ga-agbabakwa nʼime ya;

ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help