Emọs 3 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ama megide Izrel

1Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.

2“Naanị unu ka m họọrọ

nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa;

Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ

nʼihi mmehie unu niile.”

3Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije

ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?

4Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa

ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ?

Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya,

mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?

5Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala

ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?

Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi

ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?

6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,

ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?

Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla

ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?

7Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla

tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya

ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.

8Ọdụm agbọọla ụja,

o nwere onye na-agaghị atụ egwu?

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,

onye ga-ahapụ ibu amụma?

9Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd

na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị,

“Zukọtanụ nʼelu ugwu niile nke Sameria

ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya

na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.”

10“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ

nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”

11Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

“Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu;

ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike,

ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”

12Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta

naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,

otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,

na nkuku isi ihe ndina

na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.”

13“Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.

14“Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha,

aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel.

Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa,

mee ka ha daa nʼala.

15Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi,

na nke ha wuru maka oge okpomọkụ;

aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo.

Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help