Ekiliziastis 5 - Igbo Contemporary Bible 2020

Kwụghachi nkwa ị kwere Chineke

1Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.

2Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu

maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị,

maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.

Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe

ma naanị nʼụwa ka ị nọ,

nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.

3Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,

otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.

4Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.

5Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.

6Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?

7Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.

Akụnụba enweghị isi

8Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha.

9Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.

10Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.

Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.

Nke a bụkwa ihe efu.

11Akụ na-abawanye,

ndị na-eri ya na-abawanyekwa.

Olee uru ha bara nye onyenwe ha

karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?

12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,

ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,

ma oke iriju afọ onye ọgaranya

anaghị ekwe ya rahụ ụra.

13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,

mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,

14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi

nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,

o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.

15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,

otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.

O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile

ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.

16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.

Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.

Gịnị bụ uru ya,

mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?

17Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,

site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.

18Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.

19Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.

20Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help