Ilu 18 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,

na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.

2Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.

Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.

3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,

otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.

4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,

ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.

5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,

si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.

6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,

ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.

7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,

egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.

8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,

ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya

bụ nwanne nke onye mbibi.

10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,

ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,

ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

12Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,

ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.

13Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị

bụ enweghị uche na ihe ihere.

14Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,

ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?

15Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,

nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.

16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,

ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.

17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,

tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.

18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ

dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.

19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.

Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.

20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.

Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.

21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.

Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.

22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.

Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.

23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;

ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.

24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,

ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help