Izikiel 18 - Igbo Contemporary Bible 2020

Mkpụrụobi mehiere ga-anwụ

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, sị,

2“Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel?

“ ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha,

eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’

3“Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel.

4Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.

5“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume

nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,

6onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri

maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị,

onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya,

maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.

7Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,

kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,

ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,

kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,

na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.

8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,

ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.

Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,

na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.

9Ọ na-edebezu iwu m niile,

na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi.

Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ;

ọ ghaghị ịdịkwa ndụ,

otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,

11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:

“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,

na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;

12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.

Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.

Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.

Ọ na-efe arụsị,

na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.

13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.

O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.

14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.

15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu

maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.

Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.

16Ọ dịghị emegbu onye ọbụla,

maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ.

Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,

kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya,

na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;

17ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla,

na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego,

na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile.

Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ.

18Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.

19“Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ.

20Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.

21“Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.

22Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere.

23Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ?

24“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ.

25“Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?

26Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ.

27Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya.

28Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.

29Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?

30“Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ.

31Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ?

32Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help