Abụ Ọma 150 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 150Ka ihe niile too Onyenwe anyị

1Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.

Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.

Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

3Werenụ opi ike too ya,

werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,

jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

5werenụ ogene too ya,

werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help