Job 27 - Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu ikpeazụ Job nye ndị enyi ya

1Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:

2“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,

Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.

3Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,

mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,

4egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,

ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.

5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;

ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.

6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;

o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.

7“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,

ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.

8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,

mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?

9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya

mgbe nsogbu dakwasịrị ya?

10Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?

Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?

11“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;

agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.

12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,

gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?

13“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,

nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

14Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;

ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.

15Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;

ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.

16Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,

ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,

17ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,

ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.

18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,

dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.

19Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;

mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.

20Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;

oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.

21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;

ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.

22Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere

mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.

23Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,

were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help