Abụ Ọma 124 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 124Abụ nrigo. Nke Devid.Ekele maka mgbapụta

1A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,

ka Izrel kwuo,

2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,

mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,

3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị,

ha gaara eloda anyị na ndụ;

4idee mmiri gaara iri anyị,

oke mmiri gaara ebufu anyị,

5ebili mmiri niile

gaara ebufu anyị.

6Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị

ka ha jiri eze ha dọrie anyị.

7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si

gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya;

ọnya ahụ agbajiela,

anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.

8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị,

onye kere eluigwe na ụwa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help