Aịzaya 12 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Otuto

1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,

“Aga m eto gị Onyenwe anyị.

Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,

ma ugbu a, iwe gị adajụọla;

ị kasịkwara m obi.

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;

aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.

Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,

ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”

3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri

site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.

4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,

“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya;

meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ;

kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.

5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.

Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.

6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ.

Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help