Abụ nke Abụ 6 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Enyi

1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,

ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere?

Olee ụzọ o sitere?

Ka anyị soro gị chọọ ya.

Onye a hụrụ nʼanya

2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,

nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,

ijegharị nʼetiti okoko urodi,

na ịchịkọta okoko lili.

3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.

Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.

Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;

Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.

5Wepụ anya gị nʼebe m nọ,

nʼihi na i jirila anya gị dọta m.

Agịrị isi gị dị ka igwe ewu

nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.

6Eze gị dị ka igwe atụrụ

nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.

Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,

ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.

7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị

dị ka pomegranet e kere abụọ.

8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,

na iri ndị iko nwanyị asatọ,

na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,

9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.

Naanị otu nwanyị nne ya nwere,

ọ masịrị onye mụrụ ya.

Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,

ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.

Ndị Enyi

10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,

nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,

dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

11Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,

ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,

ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,

na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.

12Tupu m mata ebe m nọ,

agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.

Ndị Enyi

13Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;

laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya

dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help