1 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?
Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
2Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,
ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
3Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,
ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
4Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,
nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.
5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ;
ọ na-elelị ndị iro ya niile.
6Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.
Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”
7Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,
nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
8Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,
nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ,
na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.
9Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,
ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye.
Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
10Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,
ọ na-azọpịakwa ha.
11Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola.
O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”
12Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,
echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.
13Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?
Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya,
“Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?
14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha.
Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
15Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile
nke a na-apụghị ịchọpụta.
16 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
17O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
18Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,
ka mmadụ efu, onye e kere eke,
ghara imenye ha egwu ọzọ.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.