1Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m,
guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ.
Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m,
na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a.
Ọsịsa Onyenwe anyị2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị,
“Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe.
Depụta ya nke ọma,
ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya.
3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,
ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,
Ọ gaghị abụkwa ụgha.
Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,
nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,
ọ gaghị anọ tee aka.
4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;
ọchịchọ ya ezikwaghị ezi
ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ.
5Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ,
onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.
Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,
ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.
Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,
ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.
6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,
“ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi,
ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya
site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’
7Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?
Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji?
Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ.
8Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,
ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ,
i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha.
9“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,
nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu,
nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.
10I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ,
sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere.
11Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.
Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.
12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,
nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike.
13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ,
na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?
14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị,
dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,
nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya,
ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.
16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.
Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu.
Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị.
Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.
17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị.
Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ,
bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha.
18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya?
Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha?
Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara,
nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.
19Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’
Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’
O nwere ike izi mmadụ ihe?
Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie,
ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.”
20Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya.
Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.