Ilu 29 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ,

nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.

2Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ,

ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.

3Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa,

ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.

4Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu,

ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.

5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma

bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.

6Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama.

Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.

7Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye,

ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.

8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile,

ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.

9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,

onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.

10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,

ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.

11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,

ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.

12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha,

ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.

13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a:

ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.

14Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe,

a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

15Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,

ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.

16Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị,

ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.

17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.

Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.

18Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro,

ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

19Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị,

nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.

20Olileanya dịrị onye nzuzu

karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.

21Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi,

ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.

22Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ,

onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.

23Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa,

ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.

24Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha,

a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.

25Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya,

ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.

26Ị chọrọ ikpe ziri ezi?

Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.

27Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị;

ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help