Zekaraya 13 - Igbo Contemporary Bible 2020

Nsachapụ mmehie

1“Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.

2“Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile.

3Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.

4“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ,

5Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’

6Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’

Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ agbasasịa

7“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,

na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,”

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

“Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,

igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.

Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.

8Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,

“Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,

ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.

9Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.

Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,

jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.

Ha ga-akpọku aha m,

aga m azakwa ha.

Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’

Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help