Abụ Ọma 145 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 145Abụ Ọma otuto, nke Devid.Ịdị mma nke Chineke

1Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze;

aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

2Ụbọchị niile ka m ga-eto gị

jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

3 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.

4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ;

ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.

5Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị,

aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.

6Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile,

aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.

7Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu

jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.

8 Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko,

ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.

9 Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị;

o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.

10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị;

ndị nsọ gị na-aja gị mma.

11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị.

Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,

12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche

na ebube nke ịdị mma alaeze gị.

13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile

na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.

14 Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada

na-akwagide ndị niile dara mba.

15Olileanya ihe niile dị na gị,

ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.

16I na-asaghepụ aka gị

na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.

17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi;

ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.

18 Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya,

bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.

19Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya;

ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.

20 Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya,

ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.

21Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị;

ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya

ruo mgbe ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help