Jona Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Jona bụ onye amụma Chineke kpọrọ zie ka ọ gaa zisaara ndị Ninive, obodo ukwu nke Asịrịa oziọma, banyere ikpe ọmụma nke na-aga ịdakwasị ha. Mgbe Jona nụrụ ozi a, ọ jụrụ ịga ebe Chineke ziri ya ka ọ gaa. Kama o mere ngwangwa chọọ isite nʼihu Chineke gbapụ. Ọ gbabanyere nʼụgbọ mmiri. Ma e si nʼebe ahụ tụnye ya nʼoke osimiri, ebe azụ buru ibu nọ loo ya. Mgbe Jona jikere ime ihe Chineke ziri ya, azụ ahụ gbọpụtara ya nʼelu ala. Emesịa Jona kwusaara ndị Ninive okwu Chineke, nke mere ka ha chegharịa. Ma nchegharị ndị Ninive chegharịrị wutere Jona, nʼihi na ọ bụrịị ọchịchọ obi ya ka Chineke laa ha nʼiyi. Ma akwụkwọ a na-egosi anyị na ọ bụghị ọchịchọ Chineke ka ndị mmadụ laa nʼiyi. E jikwa ọnụnọ Jona nọrọ nʼafọ azụ maa atụ ọnụnọ nke Kraịst nọrọ nʼili. (Lee Matiu 12:38-41).Usoro e si dee ya:Nnupu isi Jona 1

Ekpere Jona nʼafọ azụ 2

Nrube isi Jona 3

Obi ọjọọ Jona na obiọma Chineke 4

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help